I thank God for life over my family
Ok
Contact information, map and directions, contact form, opening hours, services, ratings, photos, videos and announcements from Ok, Education, Port Harcourt.
17/06/2019
DADA(NATURAL DREAD)
O na abu onye obula nwa ya nwere Dada, ogbara n'eje n'ulo uka ka fada maobu Pasito kpuchaa nwa ya isi.. Ufodu si na Dada bu ihe aburu onu ,mechie onu onye gwara gi😠😠😠. Dada n'ilea ifuru ,ufodu bucha na mmiri ka ha siri bia,ma marakwa amara na ihe obula si na mmiri siri ezigbo ike. Ahurum nwata obula nwere isi Dada na anya nke ukwuu,Dada abughi ihe eji egwu egwu. Makana ufodu si na Dada bu ihe ojoo ,ya meziri ojiri buru na onye obula mutara nwa Dada ihere ana eme ya ikpo ya bu nwa apuapu,ogbara achoghari ebe o ga ekwochapu ya ntutu isi ka nwa mmadu were dizie ka osa. Kam gwakwa gi ,nwa obula bu Dada na eweta ngozi na ezi n'ulo,umuaka ahu n'esi ezigbo ike ma nwekwaa amamihe puru iche. Anaghi emetu Dada aka n'isi otu obula osiri masi gi. Onwere Dada nwekwaa Dada di n'ime Dada ,nkea bu udiri o na abu ,ikachie nti kpuchaa ya okachikwa nti puputakwa ozo. Ejirom nwata obula nwere Dada egwu egwu,ha n'enyem añuri oge obula mu huru ha ,isi ndia bu isi agbo ncha. Ijugokwa onwe gi ihe oji abu pasito maobu fada choo ikpu ha isi ha asi gi weta okuko ocha?
Dada si na mmiri ,ejirokwa isi fa achu aja makana ha bu isi agbo ncha. Ijugonu onwe gi ihe ndi Yoruba na ndi uka akwa ocha ejighi eji ndi Dada egwu egwu? Naani be anyi ka ihe n'apukarisi iche ,nne /nna agwa gi ihe di na Dada you must kwere. Oburu na inwere obere nwa bu Dada n'ulo,biko ina asa ya ahu ,sachaa ya isi ,itee ya ude aki n'isi. Jiri ncha oji(black soap) were saa ya isi ,unu ejizila umu ncha maobu ude ndi oyiligbo were emebi umu ife. Oge obula ofu mkpuru ntutu ya dapuru n'ala ,biko tuturu ya dobere ya ofu ebe,etufukwala ntutu obula dapuru ya n'isi oge obula I na asa ya ahu.
Anaghikwa akpu ha isi ma oburu na ochoghi ya,makana ikwechiri kpuo ha isi ,mmuo di ha n'isi ekwechiri mee gi ife ifu n'anya,naani ma ojiri onu ya si na ochoro ka akpuo ya isi ya. Otutu n'ime ha bu ndi nwere okpukpo oku,onwekwara ndi o ga abu imetu ha aka n'si fa ayaba aru.Unu egbuzila akaraka umu unu site na ikpu ha isi mgbe ha amabeghi ihe ,oge ufodu nwata agaghi ama na onwere okpukpo oku makana akpuchara ya isi mgbe oka na awa napkin ,ihe ana enyeghari ya nsogbu elu na ala. Hapu ya ka ojiri onu ya gwa gi na ochogo ikpu ya,onye n'akpukwanu ya bu isi marakwanu onwe ya.
Read what is happening
Click here to claim your Sponsored Listing.
Location
Category
Website
Address
Port Harcourt
500