ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO

ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO

Share

Ebe ana-amụta ihe niile gbasara asụsụ Igbo. Ihe ọchị nakwa ihe nkiri egwuregwu n'Igbo.

ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO, Lungi Barracks, Abuja (2023) 21/12/2023

Ndeewonu
"Exciting news! We are thrilled to announce that ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO is now listed on SchoolAndCollegeListings, a leading online directory for educational institutions.
Visit our listing at https://www.schoolandcollegelistings.com/NG/Abuja/102345678833540/%E1%BB%8CM%E1%BB%A4M%E1%BB%A4-AS%E1%BB%A4S%E1%BB%A4-IGBO to explore our comprehensive educational programs, dedicated faculty, state-of-the-art facilities, and student success stories.
Discover why we're the perfect choice for nurturing young minds and providing quality education. Help us spread the word! Share our listing with your friends, family, and community.
Your support means the world to us. Together, let's empower more students and shape a brighter future."

ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO, Lungi Barracks, Abuja (2023) Ebe ana-amụta ihe niile gbasara asụsụ Igbo. Ihe ọchị nakwa ihe nkiri egwuregwu n'Igbo.

01/08/2023

Nnoonụ n'ọnwa ọhụrụ nke August!
Ka ebumnuche ọma gị bịa ná mmezu n'ọnwa a. Iseee

20/07/2023

AKPAALAOKWU TAA BỤ:
Ịta akwa ndụ...Ime ihe àlà na-asọ nsọ.
Ndeewonụ 🤗

16/07/2023

Ụtụtụ Ọma nụ!
Kedụ mpụtara Akpaalaokwu ndị a?
1. Egbe na ọkụkọ...?
2. Onye Ire abụọ...?
3. Ọ bụ mbe...?


14/07/2023

AKPAALAOKWU TAA BỤ:

✓Ịta ọjị aka ____ Ikwe ekele.
✓Ńnú na mmanụ____ Ezigbo ndị enyi

12/07/2023

Nnọọnụ n'ihe ọmụmụ nke taa!

ISIOKWU: AKPAALAOKWU (IDIOMS)

NKỌWA: Akpaalaokwu bụ okwu amamihe dị nke nke e ji achọ asụsụ mma.

Akpaalaokwu na-adị na nkebi ahịrịokwu ma ilu na-adị n'ahịrịokwu zuru ezu.

Akpaalaokwu na-eme ka asụsụ Igbo dị ụtọ na ntị ma nwekwaa ebube.

ỌMỤMAATỤ NA NKỌWA YA
✓ Afọ ịta mmiri. _______ Inwe obi ọjọọ.
✓ Ịta isi mbe. _________ Ihe afụghị ụfọ.
✓ Ime aka abụọ. ________ Izu ohi. dgz

Kwa ụbọchị, a gam n'edepụta ọmụmaatụ Akpaalaokwu ndị ọzọ.

Ụnụ emeela! 🤗🙋 Ndụ Nwoke, ndụ nwaanyị!


12/07/2023

Ndeewonụ 🤗
Ka anyị leba anya na isiokwu anyị taa bụ AKPAALAOKWU.
Sonyerem n'ihe ọmụmụ nke taa.

11/07/2023

Ndeewonụ 🤗🙋

ISIOKWU ANYỊ TAA BỤ:

MKPỤRỤOKWU NDỊ A NA-EDESA EDESA (WORDS WRITTEN SEPARATELY)

✓ Ngwa Ngwa
✓ Ọsọ ọsọ
✓ Ma ọ bụ
✓ Ugbu a
✓ Ọ bụla

MKPỤRỤOKWU NDỊ A NA-EDEKỌ ỌNỤ
(WORDS WRITTEN TOGETHER)

✓ Nwanna
✓ Ụmụnne
✓ Ụmụafọ
✓Ụmụaka
✓ Oriakụ
✓ Ọsịsọ
✓ Dịnta
✓ Ikpeazụ. dgz...

Ohere dịrị gị idenye mkpụrụokwu ndị ọzọ ị maara a na-ede n'usoro nkụzi a.

Imeela biko!


11/07/2023

Kedụ ka unu mere?
Ị nụla maka mkpụrụokwu ndị a na-edesa edesa na ndị nke a na-edekọta ọnụ?

06/07/2023

Depụta aha Igbo gị na mpụtara ya!

Mụ: ADANNA ----- father's first daughter.

06/07/2023

Ndeewonu 🙋

ISIOKWU ANYỊ TAA BỤ
IGỤ NWA AHA (NAMING)
Igụ nwa aha bụ omenaala zuru Igbo niile ọnụ. Ọ bụ ụbọchị nwaanyị pụtara n'ọmụgwọ ka a na-aba nwa aha.
A na-agụ nwa aha site n'ihe mere mgbe a dị ime ya maọbụ mgbe a na-amụ ya.
A na-abakwa nwa aha site n'ihe mere maọbụ na-eme n'ezinaụlọ.

ỌMỤMAATỤ AHA IGBO ỤFỌDỤ
Chizọbam ..... God be saving me
Adanna...... Father's first daughter
Ọzọemena..... Another should not happen
Chinyere..... God gave
Onyinyechi.... God's gift
Chiọma.... Good God
Chikere..... God created
Ugonna.... Father's pride

ỤFỌDỤ AHA ỤMỤAKA A MỤRỤ ỤBỌCHỊ AHỊA
Adaeke
Nwaorie
Nwokeorie
Mgbeafọ
Nwankwọ dgz...

IMEELA, EZIGBO MMADỤ DỊKA GỊ

Denye ihe i chere n'igbe ahịrịokwu.


Want your school to be the top-listed School/college in Abuja?

Click here to claim your Sponsored Listing.

Location

Telephone

Website

Address

Lungi Barracks
Abuja
00100