25/05/2025
ÁDỤ̀ NA URU Ọ BARA
Ádụ̀ bụ otu n'ime nri nsinagbo ndị Igbo nke na-epu n'ala ma na-amị n'elu. Ya mere Igbo ji atụ ilu wee sị, "Ejikwala ụtọ ọgbọnọ rahụ n'ukwu ádụ̀" maọbụ "Agaghị m eji ụtọ ọgbọnọ wee rahụ n'ukwu ádụ̀." Ọ na-adị n'ụdị eriri ma o puo ome. Ọ na-amị amị mana ọ pụtaghị na anaghị eri nke a kụnyere n'ala eri.
A na-eji osisi kolie ya elu ka ọ ghara ịbasa n'ala nkịtị iji baa ezi ụba nke ga-eme ka ọ mịa ọtụtụ mkpụrụ gbara agba.
Ọ dị n’ụdị abụọ, adụ ilu na ireatụrụ. E ji ya eme ọtụtụ ihe bụ nke a na-eri eri n'ala Igbo.
Nri ọtịta: Naanị sie adụ ole ị chọrọ ka o ghee nke ọma, kwado mmanụ e tinyere ose, ụkpaka, ụtazị, agbo(ọ na-adị ka kọrị mana ọ bụghị), dgz. Rie ya dịka e si eri ji na mmanụ. Mgbede ụfọdụ, ụfọdụ na-esikwa ya ma be ya achịcha adụ(flakes) nke e nwekwara ike taa n'ọkpọ maọbụ sie ya esi tupu ọtịta ya.
Nri olulo: sie ya ka o ghee nke ọma, gbachasịa ya, wunye ya n'ikwe, sụọ ya nke ọma ma werekwa ọmarịcha ofe ọbụla dị gị mma lobanye ya. Nkea mee, i riela ụtara adụ.
Ọzọ, a na-agwọkwa ya agwọ n'oge ụfọdụ na mpaghara ụfọdụ n'ala Igbo, mana ọ na-abụkarị nke sitere n'achịcha ya. E jikwa ya esi ọkpa. Ọ bụrụ na i tinye adụ a kwọrọ akwọ n'ọkpa sie, ọ na-eme ka ọ sie ike ma dịwanye ụtọ. Marakwa amara na a naghị etinye adụ ilu n'ọkpa mana nri ndịọzọ bụ ka onye si chọọ.
AHỤIKE
Ọnyáafọ: E ji adụ ilu agwọ ọrịa ọnyáafọ nakwa afọ ọrụrụ.
NSỌ ADỤ
ádụ̀ enweghi onye ọ sọrọ nsọ. Ọ dị ọrịa ọ sọrọ mmadụ ya nọrọ n'ime ya, adụ agaghị enye ya nsogbu ma o rie ya. Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa ọnyáafọ, were garị ahụ a gwara gị erila were adụ a kwọrọ akwọ ngwakọ na ya, rizie ya ka ị hụ ebube Ekerụwa. Maọbụ kwọọ naanị ya na-eri ya otu ahụ. Ị bụrụ onye ọrịa Ọtọbịrịbịrị etinyekwala ihe ọzọ na ya, k**a chọọ nke ilu na ireatụrụ ngwakọ ha ọnụ.
Maka inweta ya, usoro ịkọ maọbụ nchekwa ya, zitere anyị ozi.
ÁDỤ̀, ọkpọkọpị✊ dị na nri.
Ka anyị kwalitenu Akaọrụ na ọdịnaala Igbo. Following Love