08/07/2025
Okwu akpụ n'ọnụ!
EKWE KỤỌ AMA AGBAA
(Ka ihe si gaa n'obodo na nso nso a)
STEETI ỌHỤRỤ MAKA SOUTH EAST!
Anyị ka nọ kwa na-eleba anya n'okwu gbasara ikewapụtara ndị Igbo Steeti ọzọ. Naijeria dị ogbe rijọn isii. Rijọn ndị ọzọ dị cha steeti isii. Otu rijọn(North West) dị steeti asaa. Ọgwụchana naanị rejọn South East (Rijọn ndị Igbo) nwere Steeti pekarisịrị mpe. Ha nwere naanị Steeti ise.
Biko ka anyị gaa na mbido Naijiria:
Na mbụ onweghi ihe dị ka Naijiria. Ihe e nwere bụ protektọrekt Nọtụ na Sautụ nke ndị ọcha (Colonialists) jikpọrọ anyị n'ohu jiri mee ka ọchịchị obodo dịrị ha mfe. Ọ bụ n'afọ 1914 ka onye ọcha na-achị ogbe daịrektọret abụọ ndị a ọnụ, kpọrọ ya Naijiria.
Ọ bụ kwa nwaanyị onye ọchá (Enyi nwaanyị Lord Lugard) gụrụ anyị Naijiria. N'oge a usoro ha ji-achị ọchịchị bụ nke ha kpọrọ 'INDIRECT RULE' system of governance.
Etu a ka ọdigidere rue mgbe o nyewere ụmụafọ obodo anyị, bụ kwa ndị gụrụ akwụkwọ mmekpaahụ n'ahụ, ha wee bido hikụwa otū ngaghịrị iwe (Pressure groups) ha ji na-agwa ndị ọcha okwu sị ha kwadowe ịhapụrụ ndị isi ojị ọchịchị. Ndị so n'otu a bụ Herbert Macaulay, Dr Nnamdị Azikiwe, Chiif Ọbafemi Awolowo, Alhaji Tafawa Balewa, Sir Okotie Eboh na kwa ndị ọzọ.
Ha mesoro ndị ọcha a (Colonial Masters) okwu na ụka na obi ezuike ka ha nwee ike nweta mnwere onwe nke Naijiria.
Ihe dị mkpa m chọrọ ịrụtụ aka bụ na onye Igbo nọ n'isi na mbọ niile ndị a. Emesịa ndị be anyị chịwa. Ekewara Naijiria ụzọ atọ kpọ ha Northern Region, Western Region na Eastern Region. A hapụkwara rijọn ndị a ka ha na-eto ka ike ha.
Ndị igbo nwere ike dozie ala igbo site n'ọchịchị Premier Michael Iheọnụkara Ọkpara onye nọ n'isi ọchịchị Eastern Region.
Ka ọchịchị Naijiria na-agbanwe ebidoro kewasawa steeti. Ka ọ dị ugbua ndị ugwụ́ enwela steeti iri na itolu, ndị ndịda enweé steeti iri na asaa nke ndi Igbo nwere naanị ise n'ime ha.
Ndị ìgbo kwuru okwu sị: "Oke abanyịghịre bụ iro". Ọ bụ kwa otu iro a ahụrụ ndị Igbo ka-eji were ihe ruru ha e nye ndị ọzọ.
Ụmụ Igbo teta nụ n'ụra! Chị ụtụtụ awaala. Ka anyị wụọ gidigidi. Maka na gidigidi bụ ugwu eze. Ka anyị were ụtụtụ chọwa ewu ojii. Ka anyị ghara i ji agwa 'obiawụghịotu' (Ndị kwe, ma ndị ekweghi) tụfuo ohere ọma nke inweta otu steeti ọzọ, nke ga-eme mbọ anyị na-agba i ji mee ka anyị kwụdebe rejọn ndị ọzọ laa n'iyi. Ka anyị dum nwé otu obi. Asịkwana na, e ji kwa gbaa nwa nnụnụ nne ya e felaga, mee ka ohere ọma anyị nwere ugbu a ghara ịgbanarị anyị.
A gụpụtala bịlị maka nke a na National Assembly, ma nabata kwa ya n'izizi.
Ala igbo maa mma, ọ maara mụ na gị, onye ọbụla tinye aka ka anyị dozie ala Igbo. Anyị chọrọ steeti ọhụrụ!
*BIKO TỤSAA OZI A!
*BIKO TINYE ỌNỤ N'OKWU A!
Abụ m: Nwaafọ Igbo Ikeagwụchi Nwosu.
B.A (Hons) Igbo, PGD Masscom, M.A (Igbo Language Option), University of Lagos.
01/10/2024
AGỤỌCHA EKESAA IHE ORIRI NKE MBELATA OKE AGỤỤ!
Onye nnọchite anya ndị Ikwuanọ, Ụmụahịa North na Ụmụahịa South Federal Constituency n'Ụlọukwu Omeiwu ala anyị dị n'Abụja bụ Chịif Obi Agụọcha emeela njegharị nke nkparita ụka ya na ndị ward niile nọ ebe a ọ na-ekwuchitere ọnụ ha. O jikwara ohere a kere ha nri nke mbelata agụụ na ụbịam.
Agụọcha jikwara ohere a kọọrọ ọha na eze mejupụtara ogbe ndị a ọ na-ekwutere ọnụ ha mbọ niile ọ na-agba maka ịhụ na o kwutere ọnụ ha nke ọma. O metara ha mma site n'ibunyegasị ha akpa osikapa, akpa osikapa. Site n'omume nke ngbasa aka dị etu a, nke nkesa nri a, Agụọcha egosila na ya bụ onye ihe na eme ndị ọzọ na-ewute n'obi.
Ndị Igbo sịrị na onye rijuo afọ nwanne ya a gbara ọnụ, ya laba ụlọ ọ ji aghaa ehi ụra?
Ọ bụ m, Ikeagwụchi Nwosu, si na: Ụlọ mgbasa ozi, 'LEARN IGBO LANGUAGE'
IGBO BỤ IGBO (Igbo Academy) edebatara unu ozi a. Email: [email protected]
WhatsApp: 08035766741
03/09/2024
Maka nkepụta Steeti ọhụrụ nye ndị Igbo!
EKWE KỤỌ AMA AGBAA
(Ka ihe si gaa n'obodo na nso nso a)
STEETI ỌHỤRỤ MAKA SOUTH EAST!
Anyị ka nọ kwa na-eleba anya n'okwu gbasara ikewapụtara ndị Igbo Steeti ọzọ. Naijeria dị ogbe rijọn isii. Rijọn ndị ọzọ dị cha steeti isii. Otu rijọn(North West) dị steeti asaa. Ọgwụchana naanị rejọn South East (Rijọn ndị Igbo) nwere Steeti pekarisịrị mpe. Ha nwere naanị Steeti ise.
Biko ka anyị gaa na mbido Naijiria:
Na mbụ onweghi ihe dị ka Naijiria. Ihe e nwere bụ protektọrekt Nọtụ na Sautụ nke ndị ọcha (Colonialists) jikpọrọ anyị n'ohu jiri mee ka ọchịchị obodo dịrị ha mfe. Ọ bụ n'afọ 1914 ka onye ọcha na-achị ogbe daịrektọret abụọ ndị a ọnụ, kpọrọ ya Naijiria.
Ọ bụ kwa nwaanyị onye ọchá (Enyi nwaanyị Lord Lugard) gụrụ anyị Naijiria. N'oge a usoro ha ji-achị ọchịchị bụ nke ha kpọrọ 'INDIRECT RULE' system of governance.
Etu a ka ọdigidere rue mgbe o nyewere ụmụafọ obodo anyị, bụ kwa ndị gụrụ akwụkwọ mmekpaahụ n'ahụ, ha wee bido hikụwa otū ngaghịrị iwe (Pressure groups) ha ji na-agwa ndị ọcha okwu sị ha kwadowe ịhapụrụ ndị isi ojị ọchịchị. Ndị so n'otu a bụ Herbert Macaulay, Dr Nnamdị Azikiwe, Chiif Ọbafemi Awolowo, Alhaji Tafawa Balewa, Sir Okotie Eboh na kwa ndị ọzọ.
Ha mesoro ndị ọcha a (Colonial Masters) okwu na ụka na obi ezuike ka ha nwee ike nweta mnwere onwe nke Naijiria.
Ihe dị mkpa m chọrọ ịrụtụ aka bụ na onye Igbo nọ n'isi na mbọ niile ndị a. Emesịa ndị be anyị chịwa. Ekewara Naijiria ụzọ atọ kpọ ha Northern Region, Western Region na Eastern Region. A hapụkwara rijọn ndị a ka ha na-eto ka ike ha.
Ndị igbo nwere ike dozie ala igbo site n'ọchịchị Premier Michael Iheọnụkara Ọkpara onye nọ n'isi ọchịchị Eastern Region.
Ka ọchịchị Naijiria na-agbanwe ebidoro kewasawa steeti. Ka ọ dị ugbua ndị ugwụ́ enwela steeti iri na itolu, ndị ndịda enweé steeti iri na asaa nke ndi Igbo nwere naanị ise n'ime ha.
Ndị ìgbo kwuru okwu sị: "Oke abanyịghịre bụ iro". Ọ bụ kwa otu iro a ahụrụ ndị Igbo ka-eji were ihe ruru ha e nye ndị ọzọ.
Ụmụ Igbo teta nụ n'ụra! Chị ụtụtụ awaala. Ka anyị wụọ gidigidi. Maka na gidigidi bụ ugwu eze. Ka anyị were ụtụtụ chọwa ewu ojii. Ka anyị ghara i ji agwa 'obiawụghịotu' (Ndị kwe, ma ndị ekweghi) tụfuo ohere ọma nke inweta otu steeti ọzọ, nke ga-eme mbọ anyị na-agba i ji mee ka anyị kwụdebe rejọn ndị ọzọ laa n'iyi. Ka anyị dum nwé otu obi. Asịkwana na, e ji kwa gbaa nwa nnụnụ nne ya e felaga, mee ka ohere ọma anyị nwere ugbu a ghara ịgbanarị anyị.
A gụpụtala bịlị maka nke a na National Assembly, ma nabata kwa ya n'izizi.
Ala igbo maa mma, ọ maara mụ na gị, onye ọbụla tinye aka ka anyị dozie ala Igbo. Anyị chọrọ steeti ọhụrụ!
*BIKO TỤSAA OZI A!
*BIKO TINYE ỌNỤ N'OKWU A!
Abụ m: Nwaafọ Igbo Ikeagwụchi Nwosu.
B.A (Hons) Igbo, PGD Masscom, M.A (Igbo Language Option), University of Lagos.
22/06/2024