22/06/2026
🔥Ị maara aha Ọgọdọ a🤔❓
Ụmụ nwanyị Igbo dị iche iche ha na-akpọ ọgọdọ ọmụma ha👌
Lee anya na foto 👇ị ga-ahụ otu n'ime ọgọdọ ụmụ nwanyị Igbo.
Ị maara aha ụmụ nwanyị Igbo na-akpọ ya 🤔❓
✍️ Depụta ya na kọmentị 😊👇 ka anyị soro mụta ma mara ya.
📢 Njirimara ndị Igbo agaghị-anwụ🙅🙅
20/06/2026
🔥Ịbụkwa ọnye Igbo nke taa 🤔❓
Lee anya na foto ị ga-ahụ ndị nọ na ya.
Mmadụ abụọ nọ n'elu ụlọ , ma otu ọnye na-enye ya ihe ndị ha na-etinye na uko ụlọ ahụ.
Ụdị ụlọ a 🏡 ha na-arụ bụ ụdị ụlọ ndị Igbo mgbe gboo na-ebi nime ya👌
Ị hụtụla ma ọbụ bie n'ụdị ụlọ a na mbụ dịka ọnye Igbo?
Ndị bekee na-akpọ ụdị ụlọ a "Thatched house"
Ajụjụ mkparịta ụka:👇
🔹 Ịmaara aha ndị Igbo na-akpọ ụdị ụlọ a❓🤔
✍️ Depụta ya na kọmentị ka ndị amaghị maka ya mara ma mụta aha ya taa👌
20/06/2026
🔥Aha Igbo ya ọbụ gịnị 🤔❓
Ọkụkọ nwere ọke na nwunye 👌
🔹Ọke ọkụkọ ka Bekee kpọrọ "C**k" ndị Igbo kpọọ ya "Ọke Ọkpa"
🔹 Nwunye ọkụkọ ka Bekee kpọrọ "Hen"
Ajụjụ mkparịta ụka:👇
🔹 Gịnị ka ndị Igbo na-akpọ nwunye Ọkụkọ 🤔❓
Ịmaara ya?
✍️ Depụta ya na kọmentị ka anyị hụ ma ịmaara
Ịmaara aha Igbo nwunye Ọkụkọ 🤔
20/06/2026
🔥 Ndị Igbo ibem 🤗
Daalụ nụ na enyemaka ụnụ na-enye ịhụ na asụsụ Igbo anyị gbasara.🙋🙋
"Ndị Igbo Na Asụsụ Igbo page" na-asị ụnụ daalụ rinne🙌
Biko gaanụ n'iru ikwado asụsụ Igbo anyị site na ịkesaa Reels anyị, ịde azịza n'ọghere kọmentị na-igosi mmasị site na itinye ❤️ ma ọbụ 👍 n'ihe ndị anyị n'eme.
Ndị Igbo kwuru sị na "Igwe bụ ike"💪
🥰Ka anyị gbakọọ aka ọnụ hụ na asụsụ Igbo na Ọmenala Igbo na-agbasa n'ụwa niile 🌏✨
Ajụjụ mkparịta ụka:👇
🔹Ị na-asụkwa Igbo ma na-ejikwa ejiji ndị Igbo ebe ịnọ. 🤔❓
✍️Zaa ma kọmentị 😊 👇 ka anyị mara
19/06/2026
🔥Ibụkwa ọnye Igbo nke taa👀
Nje m nwanyị Igbo na-aga be nwa ya lụrụ di mụrụ nwa, ka ọleta ya na nwa ọhụrụ ọnwa ọle na ọle, ka a na-akpọ ________________ n'ala Igbo.
✍️ Depụta ihe a na-akpọ ya na kọmentị 😊👇
🥰 Omenala Igbo ga-adịrịrịoooooo🙋🙋🙋🙋
19/06/2026
📖 Ajụa Azaa✍️
Họrọ nke dabara dee n'ọghere ndị a
🔹Otu ụzọ ndị Igbo si egosi ọmenala bụ ___________(Iji ụgwọ, ịmụ amụ, Iji ejiji).
🔹Etu esi ama ụmụaka Igbo azụrụ nke ọma bụ__________( Ịnye ndị ọkenye nsọpụrụ, Ịgba egwu, ịmụ anya abalị).
🔹 Ndị Igbo bụ ndị _________( na- arụsị ọrụ ike, na-anụ agha, na-ekute mmiri).
🔹Ahịa ndị enwere n'ala Igbo bụ Eke, Orie, afọ na__________(Ndeeli, Nkwọ, Ụgbana).
🔹Nwadịọgwa bụ aha a na-agụ nwa nwaanyị amụrụ________( ebe ndị ọzọ bụ sọ ụmụ nwọke, ebe agha dị, mgbe udu mmiri).
✍️ Depụta azịza ha na kọmentị 😊👇 ka anyị hụ mà ịmaara ihe niile ndịa.
🙋🙋🙋 Igbo ga-adịgide ❤️💛💚
19/06/2026
🤷 Ịhụla Ọbere Maazị nọ na foto a 🤔👇
Lee ka ndị mụrụ ọbere Maazị a si kwadochaa ya, ma jie ya ejiji dịka nwa Igbo ọbụ.
Ọ bụrụ na nwata a na-eto, ọ ga-ebido rịba ebe mkpọrọgwụ ya si ama🤷👌
Ejiji na asụsụ bụ ihe izizi eji akuziri ụmụaka ndị ha bụ mà ha na-etolite.
Ajụjụ mkparịta ụka:👇
🔹 Kedụ otu ụzọ isi eme ka ụmụaka mara na ha bụ ndị Igbo dịka ha na-etolite 🤔❓
🔹✍️ Depụta ụzọ nke gị na kọmentị 😊 👇 ka anyị mụta.
🥰Ka anyị bido ime ka ụmụaka anyị mara ndị ha bụ kwa ụbọchị 🙌