Ndị Igbo Na Asụsụ Igbo

Ndị Igbo Na Asụsụ Igbo

Share

"Ebe ndị Igbo na-amụta, na- akparita ụka gbasara ọnwe ha, na emekọrita,na-ekekorita ma na-ahụkwa asụsụ Igbo n'anya.

22/06/2026

🔥Ị maara aha Ọgọdọ a🤔❓

Ụmụ nwanyị Igbo dị iche iche ha na-akpọ ọgọdọ ọmụma ha👌

Lee anya na foto 👇ị ga-ahụ otu n'ime ọgọdọ ụmụ nwanyị Igbo.

Ị maara aha ụmụ nwanyị Igbo na-akpọ ya 🤔❓

✍️ Depụta ya na kọmentị 😊👇 ka anyị soro mụta ma mara ya.

📢 Njirimara ndị Igbo agaghị-anwụ🙅🙅





22/06/2026

Nkebiokwu bụ nkebi ọle ma ọbụ ụda ọle dị na okwu.

Enwere ọmụmatụ na onyonyoo nkea ma ikirie ya.





20/06/2026

🔥Ịbụkwa ọnye Igbo nke taa 🤔❓

Lee anya na foto ị ga-ahụ ndị nọ na ya.

Mmadụ abụọ nọ n'elu ụlọ , ma otu ọnye na-enye ya ihe ndị ha na-etinye na uko ụlọ ahụ.

Ụdị ụlọ a 🏡 ha na-arụ bụ ụdị ụlọ ndị Igbo mgbe gboo na-ebi nime ya👌

Ị hụtụla ma ọbụ bie n'ụdị ụlọ a na mbụ dịka ọnye Igbo?
Ndị bekee na-akpọ ụdị ụlọ a "Thatched house"

Ajụjụ mkparịta ụka:👇

🔹 Ịmaara aha ndị Igbo na-akpọ ụdị ụlọ a❓🤔

✍️ Depụta ya na kọmentị ka ndị amaghị maka ya mara ma mụta aha ya taa👌





20/06/2026

🔥Aha Igbo ya ọbụ gịnị 🤔❓

Ọkụkọ nwere ọke na nwunye 👌

🔹Ọke ọkụkọ ka Bekee kpọrọ "C**k" ndị Igbo kpọọ ya "Ọke Ọkpa"

🔹 Nwunye ọkụkọ ka Bekee kpọrọ "Hen"

Ajụjụ mkparịta ụka:👇

🔹 Gịnị ka ndị Igbo na-akpọ nwunye Ọkụkọ 🤔❓
Ịmaara ya?

✍️ Depụta ya na kọmentị ka anyị hụ ma ịmaara
Ịmaara aha Igbo nwunye Ọkụkọ 🤔





20/06/2026

🔥E nwere ọtụtụ ihe a na-ahụ n'ụlọ Ụsọekwu ndị Igbo na mgbe ochie👌

Ọtụtụ nime ha adịghịzị ugbua n'ihi ihe agbanwechaala.

Ajụjụ mkparịta ụka:👇
Kedụ aha a na-akpọ nke edeghị aha ya n'onyonyo a

✍️ Depụta ya na kọmentị 😊 👇





20/06/2026

🔥 Ndị Igbo ibem 🤗

Daalụ nụ na enyemaka ụnụ na-enye ịhụ na asụsụ Igbo anyị gbasara.🙋🙋

"Ndị Igbo Na Asụsụ Igbo page" na-asị ụnụ daalụ rinne🙌

Biko gaanụ n'iru ikwado asụsụ Igbo anyị site na ịkesaa Reels anyị, ịde azịza n'ọghere kọmentị na-igosi mmasị site na itinye ❤️ ma ọbụ 👍 n'ihe ndị anyị n'eme.

Ndị Igbo kwuru sị na "Igwe bụ ike"💪

🥰Ka anyị gbakọọ aka ọnụ hụ na asụsụ Igbo na Ọmenala Igbo na-agbasa n'ụwa niile 🌏✨

Ajụjụ mkparịta ụka:👇

🔹Ị na-asụkwa Igbo ma na-ejikwa ejiji ndị Igbo ebe ịnọ. 🤔❓

✍️Zaa ma kọmentị 😊 👇 ka anyị mara





19/06/2026

Enwere ọtụtụ ihe ndị igaghi eme ebe ị na-eri nri n'ala Igbo 👌

Na onyonyoo nkea ekwuru ụfọdụ n'ime ha.

Ajụjụ mkparịta ụka:👇

🔹 Kedụ otu ihe ịmaara igaghi eme ebe ị na-eri nri n'ala Igbo 🤔❓

✍️ Depụta ya na kọmentị 😊👇 ka ndị ọzọ soro mụta.





19/06/2026

🔥Ibụkwa ọnye Igbo nke taa👀

Nje m nwanyị Igbo na-aga be nwa ya lụrụ di mụrụ nwa, ka ọleta ya na nwa ọhụrụ ọnwa ọle na ọle, ka a na-akpọ ________________ n'ala Igbo.

✍️ Depụta ihe a na-akpọ ya na kọmentị 😊👇

🥰 Omenala Igbo ga-adịrịrịoooooo🙋🙋🙋🙋

19/06/2026

📖 Ajụa Azaa✍️

Họrọ nke dabara dee n'ọghere ndị a

🔹Otu ụzọ ndị Igbo si egosi ọmenala bụ ___________(Iji ụgwọ, ịmụ amụ, Iji ejiji).

🔹Etu esi ama ụmụaka Igbo azụrụ nke ọma bụ__________( Ịnye ndị ọkenye nsọpụrụ, Ịgba egwu, ịmụ anya abalị).

🔹 Ndị Igbo bụ ndị _________( na- arụsị ọrụ ike, na-anụ agha, na-ekute mmiri).

🔹Ahịa ndị enwere n'ala Igbo bụ Eke, Orie, afọ na__________(Ndeeli, Nkwọ, Ụgbana).

🔹Nwadịọgwa bụ aha a na-agụ nwa nwaanyị amụrụ________( ebe ndị ọzọ bụ sọ ụmụ nwọke, ebe agha dị, mgbe udu mmiri).

✍️ Depụta azịza ha na kọmentị 😊👇 ka anyị hụ mà ịmaara ihe niile ndịa.

🙋🙋🙋 Igbo ga-adịgide ❤️💛💚

19/06/2026

🤷 Ịhụla Ọbere Maazị nọ na foto a 🤔👇

Lee ka ndị mụrụ ọbere Maazị a si kwadochaa ya, ma jie ya ejiji dịka nwa Igbo ọbụ.

Ọ bụrụ na nwata a na-eto, ọ ga-ebido rịba ebe mkpọrọgwụ ya si ama🤷👌

Ejiji na asụsụ bụ ihe izizi eji akuziri ụmụaka ndị ha bụ mà ha na-etolite.

Ajụjụ mkparịta ụka:👇

🔹 Kedụ otu ụzọ isi eme ka ụmụaka mara na ha bụ ndị Igbo dịka ha na-etolite 🤔❓

🔹✍️ Depụta ụzọ nke gị na kọmentị 😊 👇 ka anyị mụta.

🥰Ka anyị bido ime ka ụmụaka anyị mara ndị ha bụ kwa ụbọchị 🙌





Want your school to be the top-listed School/college in Awka?

Click here to claim your Sponsored Listing.

Location

Website

Address

Awka